Igbo, also called “Ibo,” is one of the main languages in NIGERIA, in western Africa, with over 18 million native speakers. Â It is the official language in the southeast part of Nigeria.
NA OGE DI KA NKE A (ESTA 4: 14)
‘’Onye makwanu ihe mere iji noo n’ ulo eze n’ oge di uto a’’ Akuko Esta bu ihe ngosi maka nzuko nke kwesiri ntukwasi obi dika nwanyi analu ohuru nke Christ. Site na akuko a, Chineke gosiri anyi otu nzuko kwsiri  idi, dika otu anuaru n’ime nzuko, anyi puru iji ya tunyere ndu anyi na otu na otu. Otu ihe mmuta bu na Chineke tinyere Esta na onodu di otu a site na mgbe otutu ihe mere. Oge ahu di nnoo mma nye Esta,i weere onodu ya dika eze nwanyi were gbaputa ndi nke Chineke na oge nsogbu di otu a. Chineke tinyere Esta na onodu ibu eze nwanyi na ihi oge di otua, oge ndi nke Chineke chosiri mnaputa ike. Oge inwe mmeri di ha mkpa.
Na out aka-ahu, Chineke tinyere nzuko ya bu Jisos Christ na ime uwa na ihi oge di na iru, oge di ugbua nye anyi. Na oge di otua putara mgbe ikpe azu tupuu Jisos abiaghachi azu iwere uwa dika ihe ubi. O bu oge ikpe azu na oge amara, oge ikpe azu nke Chineke turu atumatu maka nzoputa nye mmadu. Anyi nwere otutu oru nke anyi ga aru ngwa ngwa maka izoputa mkpuru obi umu mmadu, tinyekwara ikwa-ado ndi nke Chineke maka ije ozi na iga ije ha na Chineke na uzo di mma.  Ugbua bu oge ndi mmadu na awaghari na oke ochichiri na ngbagwujuanya dika Anti-Christ na nwerecha ochichi na nwa oge a foduru. Anyi bi na ime oge puru iche banyere usoro akuko maka ndu anyi.

NIGERIA
ARIRIO MBU ESTA RIORO EZE (ESTA 5:3 – 4)
Eze juru ya si Gini ka ichoro Eze nwanyi Esta, Gini bu mkpa gi?
Agam emere gi ya obuladi ma oburu inye gi otu okara alaezem. Esta zara si ‘’ oburu na O masiri eze, achorom ka gi na Heman bia rie nri m kwadooro unu taa.
Anyi na eleba anya na aririo Esta rioro eze mgbe eze siri Esta ka orio ihe obula, rueri na inye ya okara ala eze ya. Esta mere otu ihe turu ha  na anya. O choo ka O nwe oriri puru iche nye Eze na osote ya bu Heman. Nke a na egosi anyi otu  nzuko di na ekpere na ebe Chineke no, obuladi mgbe enwere nnukwu ogbahara na nsogbu nke chooro enye maka Chineke. ihe mbu O chosirike bu ka Onoro eze nso karia- (Jisos nke bu Eze ndi Eze anyi) ka ya na onye nwe anyi noro. Aririo mbu nzuko na ekpere kwesiri ibu nke a – inwe mmekorita di ndu nime Jisos di ndu, ino na iru ya na ige nti na olu ya. Nke kwesiri ibu ihe mbu na ebe anyi no, tupu mkpa anyi, nsogbu nile anyi nwere, na ihe ndi ozo, nka anyi kwesiri ibutere ya na ekpere nkwuchite onu ndi ozo.

NIGERIA
ESTHER NA MKPANAKA OLAEDO (ESTA 5: 1-3) (Igbo-Esther & the Gold Scepter)
Mgbe abali ato gasiri, Esta yikwasiri onwe ya uwe eze nwanyi ya banye n’ ime ime obi eze, nke chere ihu n’ olu nzuko ukwu di n’ ulo eze, ebe eze na-anodu n’ oche eze ya.  Ma mgbe eze huru esta bu nwunye eze, ka oguzo,onabatara ya setipukwara ya mkpanaka olaedo ya.  Esta biaruru nso metukwa onu mkpa n’ aka olaedo ahu aka.
Eze juru ya si gini ka I choro, eze nwanyi Esta? Gini bu mkpa gi? Agam emere gi ya obuladi ma o buru inye gi otu okara ala eze m.
Esta no na oke ihe egwu. O chosiri enye maka ike n’ ebe di ya by eze no dika eze nachi ala eze ndi Midia na Persia gbasara ihe odide edere maka igbu ya na ndi ya bu ndi Juu. Nke ka njo bu na okpuru iwu ndi Persia. Oweghi onye puru ibili gakwuru eze na akpoghi ya oku, obuladi Esta dika nwunye. A mara iwu siri ike na eze gakpuriri onye obula ochoro oku ka ha kparia uka tupo onye ahu abia, otua ka Esta kwuru.
HEMAN NA MORDECAI
Onwa iri na otu, abali nke abou 2009.
Esther: isi ato, Ama okwu nke abou ruo na nke ise (Esther 3:2-5)
Ndi isi ochichi eze nile n’ akpo isi ala nsopuru nye Heman mgbe obula osi n’ onu uzo ama ulo eze na-gafe, nihi na obu otu a ka eze nyere n’iwu. Ma Modikaya ekweghi igbu ikpere nye ya, okwekwaghi inye ya nsopuru. Ndi oru ndi ozo na-aju ya kwa ubochi si ya’’ Gini mere iji na enupu isi n’ iwu eze?’’ ma Modikaya anaghi ha nti. Emesia, ha gwara Heman ihe banyere ya, ka ha hu ma a ga-ahapu Modikaya n’ ihi na obu onye Juu, n’ ihi na nkea bu ihe o na-agwa ha. Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe o choputara na Modikaya juru igbu ikpere n’ ihu ya na isopuru ya.